Ka Osadebe, Oliva, Wọrịọ, na Pericomo Rutere Alammụọ

Nke

Obododịmma ọha

Ka Osadebe, Oliva, Wọrịọ, na Perikoma rutere Alammụọ
Ekwe na ọja, udu na ogene
Malite tibe, kpọba, kpọtụba

Okemmụọ na ụkwụmmụọ kwụsị gebe ntị,
Olendi bịara, olendi ji egwu bịa?
Olendi mere mmụọ adịdịmaadị teta n’ụra?
Olendi bụ ndi a na ndi a na ndi a?
Kedu mmụọ bịakwutere mmụọ?

Osadebe tọpee ọnụ, ije awele...
Oliva tibe: ọ bụ nnukwu mmanwụ!
Wọrịọ bebe: ụwa a lee! Elu ụwa nke a leeee!
Perikoma amaba oji: mụ na ndee mụ na ndee mụ na ndee!

Mmụọ achọbazie ịghọ mmadụ
Agụụ ibiri n’ahụ, iku ume, agụbazie
Mmụọ, mmadụ abụrụzie nṅomi mmụọ
Mmadụ, mmụọ-gara-njem-dị-njem-n’ime
Lọta, mmụọ achọbazie ịghọ mmadụ
Alammụọ amakụọ Alaigbo, nara ihe o jiri bịa!


Ka Osadebe, Oliva, Wọrịọ, na Perikoma rutere Alammụọ,
Ka anyị matara,n’ezie, na egwu bụ ọnya na-ama ndimmụọ
Ma bụrụzie akaraka mmadụ chọrọ

Umuigbo, anyị agaala ụwa gakwaa ụwa!
Anyị agaala mmụọ, gaa mmadụ!
Ogene na opi, ihe mere anyị.
Udu na ọyọ, ihe akarịa!

Comments