Ubi Onye

ọ na-amasị m ma m teta ụra n’ụtụtụ
Ka dimkpa nọ n’ime m tetakwa
Kwapụta ụkpa, kwapụta nkata
Wepụta mma, wepụta ọgụ

ọ na-amasị m ma m teta n’ụtụtụ
Hụ okoko ọhịa m ga-asụ
N’ala gbara uru
Na-eche afụrụ na ụda nsonye ihe

ọ na-agụ m agụụ ịhụ ka ubi siri dị ime
Mechaa mụọ kuru
Ndi rụrụnụ bụrụkwa ndi ririnụ
Aka ajaaja bụrụkwa ọnụ mmanụ mmanụ

--- Obododịmma ọha

Comments