Ndiigbo Agbọ ọhụrụ

Ị na-akụrụ ha ara nne ha
Ha ana-amị akpụ
Ị na-ata agba ha n’obi
Ha ana-ata agbakpọsị gị anya

Ndi ụlọ ha na-agba ọkụ
Ha na-achụ oke
Ndi na-ekpu ụlọ ndi ọzọ
Mgbe nke ha na-ehi mmiri

Ndiigbo adụgbolịja
Ndiigbo n’egburugbe ọnụ
Ndi na-etiri uwe Awụsa
Na-eti, “Igbo kwenu!”

Ndi na-aza aha Igbo
Ma ha amaghị asụ mọọbụ nụ Igbo
Ndi anya ha tọrọ n’ụzọ
Ndi furula efu akwụkwọ njụ jụrụ

--- Obododịmma Oha

Comments