ụlọmkpe Okigbo

Mgbịrịgba na-akpọ, na-akpọbata
O dere jụụ
Mmụọ na mmadụ na-erikọ
Mmadụ ga-abanye na mmụọ
Mmụọ ga-abanye n’ime mmadụ
Ebe a, n’agịga ọdịniihu

Mgbịrịgba, di ka oge ngabịga
Mmadụ na mmadụ na mmụọ na-erikọ
Mmụọ na mmụọ na dike na-erikọ
N’ebe a, n’ụlọmkpe Biafra, ụlọ mmụgharị

Mmadụ ga-abanye n’uchichi nke mmụọ
Mmụọ ga-apụta n’ehihie nke mmụgharị

Mgbịrịgba! Cheta nzọụkwụ m
N’agịga nke a na nke a na nke a
N’ụlọ ọnwụ bụ ndụ ebeebe

--- Obododimma Oha

Comments