Onye ọchịchị

Onye ọchịchị sị:

Kwa ụnụ chọrọ
Ka m nye ụnụ ọkụ;
Ngwa, ọkụ gbaa ụnụ.
ọkwa ụnụ chọrọ mmiri;
Mmiri maa ụnụ.
Kwa ụnụ chọrọ okporoụzọ dị mma;
Ngwanụ, tọnụ n’ụzọ.

Onye ọchịchịrị, nnannaa ha werekwa gị!

--- Obododimma Oha

Comments