Ekwe a na-amara nsogbu

by

Obododimma Oha

Ekwentị ekweghị ntị
nụrụ ihe
ụtụtụ, ehihie, uchichi
nke ka nke, a kpọọ a pịnyụọ
nke ka iwe, a kpọọ a jụba onye a kpọrọ:
onye na-aza m?

Ekwentị, ozi bụ ọnya
e kwere tọọ ute na Naijiria:
ụfọdụ sị na ha bụ enyi nọ ala bekee akpọ
ma ha nọ n’azụụlọ enyo anya
ihe ha ga-ezute,
I zitere m nke a, I buru akụnụụba nke a!


Ekwe a na-akụrụ nsogbu
ka o bilie tagbuo
ekweghị ekwe hụta ute ekwere
mgbe ahụ ntị anụrụ ihe, ọnụ ezuru ike

Ekwentị ekweghị ntị
nụrụ ihe
n’obodo mkpọtụ,
ebe iche echiche dị oke ọnụ
obodo mkpagbu
ebe azụ na-elo ibe ya, wee buo

Ekwentị kwenụ ntị
nụrụ ihe n’ime ọgbakọ
kwenụ uche tụlee ihe a na-eme
kwenụ obodo anyị so mba ndi ọzọ
zaa aha n’ọgbakọ ndi a zụrụ nke ọma

ọma-ekwe ntị
ọ bụ na ị maghị ka e si ama,
ka ọ bụ na ekwe na-amazi gị?
e mee elu, a kpọba ntị
e mee ala, a kpọba ntị
ọ bụ naanị ntị ka Bekee tụụrụ ekwe a?

Comments