Akwa Ndeeri (maka Adiele Afigbo)

Iwe zute iku, zute anyammiri, anya mmee!
Ndeeri bụ oke bụrụ agbata,
Mbata na ọpụpụ, mgbako na mwepu;
Ka ufere sobezie nnọkwara, bụrụ anya ikpeazụ.

A sịkwa na ọnwụ ama egbu?
Ya bụ anyụike jiri gbue ngwu,
Ka iwe zute iku, zute anyammiri.

Ije, nke na-anara onye ume…

N’ihe ekwe na-ekwu, akwa dị ya.
N’ude uhie na-asụ, mwute.

Ihe ikwu na-eti:

Anyụike gburu ngwu, isi adịghị ya mma;
Anyụike gburu ngwuru akọnuuche,
Ya gbukwaa akụkọ.

Ihe ibe na-ebe:

Ederi ya n’ime ndeeri;
Elo ya n’ụkọ amamiihe;
Ndi a agaghị edina n’ili ma ọlị.

-- Obododimma Oha

Comments