Uche bu akpa

Uche bu akpa
Onye obula ko nke ya
Ma, gini dikwanu n'ime akpa ahu?
Gini ka i jiri ihe di n'ime akpa i ko gota n'ahia?

Akpa ufodu di oke aru
Akpa ufodu dara chokolii
Akpa ufodu kara nka, na-adafu ihe

Uche bu akpa
Onye obula ko nke ya
Ma, akpa niile kwesiri imara ndi ko ha
Akpa niile kwesiri
I bu akpa a na-eko aga be oganiihu

Akpa ofoogeri abughi akpa ezindu
Akpa oworosu abughi akpa odozi obodo
Akpa onye-agwalam bu akpa ndi choro mkpafu

Uche bu akpa
Ma onye mara udi akpa o ko
Marakwa ma o bu akpa ko ya

--- Obododimma Oha

Comments

Chris Ogunlowo said…
Why I do have this feeling that this is a great poem even when I don't understand the language?

I've been gone too long.

How is the writing going?